Psalms 24

Abụ Ọma Devid.

Eze onyenwe ebube

1Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị;
ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
2Ọ tọrọ ntọala ya nʼime oke osimiri niile,
o mekwara ka o guzosie ike.

3Onye bụ onye ahụ nwere ike irigo nʼelu ugwu Onyenwe anyị?
Onye nwere ike ịbata guzo nʼime ụlọnsọ ya?
4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha,
onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị,
maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ.

5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị,
natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha.
6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya,
bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela

7Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama,
meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie,
ka eze ebube nwee ike ịbata.
8Onye bụ eze ebube a a?
Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike.
Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.
9Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama,
buliekwanụ ha elu, unu ọnụ ụzọ ama ochie,
ka Eze ebube nwee ike ịbatakwa.
10Onye bụ eze ebube a?
Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ọ bụ ya bụ Eze ebube! Sela
Copyright information for IboBIU